Deuteronomy 19

Obodo mgbaba

1Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile, 2mgbe ahụ, kewapụta
Obodo atọ Ndị a bụ obodo atọ ọzọ tinyere ndị mbụ e kewapụtarala nʼọwụwa anyanwụ Jọdan nʼihi ize ndụ. Ndị a ga-adị nʼebe ọdịda anyanwụ nke Jọdan.
obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
3Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.

4Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya. 5Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya. 6Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu. 7Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.

8Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa, 9nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ. 10Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.

11Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a, 12ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya. 13Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.

14Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.

Ndị akaebe

15Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.

16Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha, 17a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ. 18Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha, 19ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị. 20Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ. 21Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.

Copyright information for IboBIU